Isaiah 34

Ahụhụ dịrị mba niile

1Bịanụ nso, unu ndị mba niile, ṅaa ntị.
Geenụ ntị, unu mba niile nke ụwa.
Ka ụwa na ihe niile dị nʼime ya,
na ihe niile na-esi nʼime ya apụta nụrụ.
2Nʼihi na Onyenwe anyị na-eweso mba niile nke ụwa iwe,
iwe ya dị ọkụ megide ndị agha ha niile.
Ọ ga-ala ha nʼiyi kpamkpam,
nyefee ha nʼaka ndị ga-egbu ha.
3Ndị ha e gburu egbu ka a ga-atụpụ.
Ozu ha ga-esikwa isi.
Ugwu niile ga-ejupụta nʼọbara ha.
4Nʼoge ahụ, kpakpando niile nke eluigwe ga-agbaze,
a ga-apịakọtakwa mbara eluigwe dịka akwụkwọ,
kpakpando niile ga-ada
dịka ahịhịa osisi vaịnị kpọrọ nkụ,
dịka mkpụrụ osisi fiig chakpọrọ achakpọ.

5Nʼihi na mma agha m arụchaala ọrụ ya nʼeluigwe,
lezie anya ihe gaje ime, ọ ga-adakwasị Edọm,
ndị m mara ikpe mbibi.
6Mma agha Onyenwe anyị jupụtara nʼọbara,
abụba kpuchikwara ya,
ọbara ụmụ atụrụ na mkpi
na abụba sitere nʼakụrụ ebule
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ịchụ aja na Bozra.
O nwekwara oke ogbugbu ga-adị nʼala Edọm.
7Oke ehi ọhịa ga-esokwa ha daa,
ha na oke ehi ukwu na oke ehi nta.
Ala ga-ejupụta nʼọbara ha.
Uzuzu nke obodo ahụ ga-amịkọrọ ọbara ha.

8Nʼihi na Onyenwe anyị nwere ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ.
Ọ bụ afọ ịkwụghachi Edọm ihe ha mere Zayọn.
9Isi iyi ndị Edọm niile ga-agbanwe gbajie ojii,
uzuzu dị nʼala ga na-ere ọkụ dịka sọlfọ (ntụ ọkụ),
ala ahụ niile ga-enwuru ọkụ dị ka unyi ojii.
10Ọ gaghị anyụ anyụ nʼabalị maọbụ nʼehihie;
anwụrụ ọkụ ya ga na-ala nʼelu ruo ebighị ebi.
Ala ahụ ga-atọgbọrọ nʼefu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ;
ọ dịghị onye ga-esitekwa nʼebe ahụ gafee ọzọ.
11Ikwighịkwighị nke ọzara na okwolo ga-enweta ya,
ikwighịkwighị ukwu na ugolọma ga-akpa akwụ ha birikwa nʼebe ahụ.
Chineke ga-eseti nʼelu Edọm,
eriri ọtụtụ nke ọgbaaghara,
na ihe ịtụ mgbidi nke e tikpọrọ etikpọ, tọgbọrọ nʼefu.
12Ndị ya a na-asọpụrụ agaghị ahụkwa ihe ọbụla nʼebe ahụ nke ha ga-akpọ alaeze.
Otu a kwa, ụmụ ndị eze ya niile agaghị adịkwa.
13Ogwu ga-etochi ụlọ ukwu ya niile;
ebe ya niile e wusiri ike ga-aghọ ahịhịa ogwu,
ọ ga-abụkwa ụlọ nkịta ọhịa
na nke ikwighịkwighị.
14Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ.
Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa.
Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha,
chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.
15Ikwighịkwighị ga-akpa akwụ ya nʼebe ahụ.
Ọ ga-anọkwa nʼebe ahụ yie akwa, zụọ ụmụ ya,
lekọtaa ha site nʼiji nku ya kpuchie ha.
Ebe ahụ kwa ka ndagbụ ga-ezukọkwa,
nke ọbụla na ibe ya.
16Nyochaa akwụkwọ nsọ ka ị gụọ ihe Onyenwe anyị gaje ime:

Ọ dịghị anụ ọhịa ọbụla ga-efu.
Ọ dịghị nke ọbụla ga-anọ nʼebe ahụ hapụ ịkpọ ibe ya,
nʼihi na ọnụ ya enyela iwu a.
Mmụọ ya ga-achịkọtakwa ha.
17Ọ bụ ya onwe ya ga-ekewa ala ahụ,
jiri ihe ọtụtụ nʼaka keere ha oke ahụ.
Ha ga-enweta ya ruo mgbe ebighị ebi,
nwekwa ebe obibi nʼebe ahụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Copyright information for IboBIU